Native Bible

Numbers 17:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Tinye mkpanaka Erọn nʼihu Ihe Ama ahụ, ka ọ dịgide nʼebe ahụ dịka ihe ama nye ndị nnupu isi. Nke a ga-eme ka ntamu ndị a megide m kwụsị, ka ha ghara ịnwụ.”

Numbers 17:10 in English

Numbers 17:10 · Berean Standard Bible

The LORD said to Moses, “Put Aaron’s staff back in front of the Testimony, to be kept as a sign for the rebellious, so that you may put an end to their grumbling against Me, lest they die.”

Context

8Nʼechi ya, Mosis banyere nʼụlọ nzute Ihe Ama ahụ chọpụta na ọ bụghị naanị na mkpanaka Erọn, onye nọchitere anya ebo Livayị, amaala ifuru, kama na ọ waala okoko ma mịakwa mkpụrụ osisi chara acha a na-akpọ alụmọnd. 9Mgbe ahụ, Mosis sitere nʼihu Onyenwe anyị wepụta mkpanaka ndị ahụ niile gosi ha ndị Izrel niile. Ha hụrụ ha, ma nwoke ọbụla weghachiri mkpara osisi nke ya. 10Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Tinye mkpanaka Erọn nʼihu Ihe Ama ahụ, ka ọ dịgide nʼebe ahụ dịka ihe ama nye ndị nnupu isi. Nke a ga-eme ka ntamu ndị a megide m kwụsị, ka ha ghara ịnwụ.” 11Ya mere, Mosis mezuru ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. 12Ma ndị Izrel zara Mosis sị ya, “Ndị nwụrụ anwụ ka anyị bụ! Ofufu ka anyị furu. Nʼezie anyị bụ ndị furu efu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.