Native Bible

Numbers 16:48 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O guzokwara nʼetiti ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ tutu ihe otiti ahụ akwụsị.

Numbers 16:48 in English

Numbers 16:48 · Berean Standard Bible

He stood between the living and the dead, and the plague was halted.

Context

46Mgbe ahụ, Mosis sịrị Erọn, “Ngwa, were ihe ịgụ ọkụ ma site nʼebe ịchụ aja gụnye ya ọkụ. Tinye ya ụda na-esi isi ụtọ. Burukwa ya gaa ngwangwa nʼetiti nzukọ Izrel ka i kpuchiere ha mmehie ha, nʼihi na iwe ọkụ Onyenwe anyị adakwasịla ha. Nrịa nrịa na-efe efe amalitekwalarị ibibi ha.” 47Erọn mere dịka Mosis kwuru. O mere ngwangwa gbaba nʼetiti ndị Izrel nʼihi na nrịa nrịa ahụ ebidola nʼezie ịdakwasị ha. Erọn mụnyere ụda na-esi isi ụtọ ahụ ọkụ, si otu ahụ kpuchiere ha mmehie ha niile. 48O guzokwara nʼetiti ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ tutu ihe otiti ahụ akwụsị. 49Ma ihe otiti ahụ egbuolarị puku mmadụ iri, puku anọ na narị asaa (14,700). A gụnyeghị ndị niile ahụ so Kora nwụọ nʼụbọchị gara aga. 50Mgbe ahụ, Erọn laghachikwutere Mosis nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, nʼihi na nrịa nrịa ahụ na-efe efe akwụsịla. 16:7 Nke a na-egosi na ha agafeela oke e nyedebere ha. 16:9 Dit 10:8 16:14 Ị ga-eme ha ka ndị ohu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.