Native Bible

Numbers 16:45 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Sinụ nʼetiti ọgbakọ a pụọ ka m bibie ha nʼotu ntabi anya.” Ha dara kpuo ihu nʼala.

Numbers 16:45 in English

Numbers 16:45 · Berean Standard Bible

“Get away from this congregation so that I may consume them in an instant.” And Moses and Aaron fell facedown.

Context

43Mgbe ahụ, Mosis na Erọn gara nʼihu ụlọ nzute ahụ. 44Ma Onyenwe anyị gwara Mosis sị, 45“Sinụ nʼetiti ọgbakọ a pụọ ka m bibie ha nʼotu ntabi anya.” Ha dara kpuo ihu nʼala. 46Mgbe ahụ, Mosis sịrị Erọn, “Ngwa, were ihe ịgụ ọkụ ma site nʼebe ịchụ aja gụnye ya ọkụ. Tinye ya ụda na-esi isi ụtọ. Burukwa ya gaa ngwangwa nʼetiti nzukọ Izrel ka i kpuchiere ha mmehie ha, nʼihi na iwe ọkụ Onyenwe anyị adakwasịla ha. Nrịa nrịa na-efe efe amalitekwalarị ibibi ha.” 47Erọn mere dịka Mosis kwuru. O mere ngwangwa gbaba nʼetiti ndị Izrel nʼihi na nrịa nrịa ahụ ebidola nʼezie ịdakwasị ha. Erọn mụnyere ụda na-esi isi ụtọ ahụ ọkụ, si otu ahụ kpuchiere ha mmehie ha niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.