Ọnụọgụgụ 16:25
Numbers 16:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mosis biliri jekwuru Datan na Abiram, ndị okenye Izrel sokwa Mosis.
Numbers 16:25 in English
Numbers 16:25 · Berean Standard Bible
So Moses got up and went to Dathan and Abiram, and the elders of Israel followed him.
Context
23Ma Onyenwe anyị zara Mosis sị ya, 24“Gwa nzukọ Izrel niile sị ha, ‘Wezuganụ onwe unu site nʼụlọ ikwu Kora, Datan na Abiram.’ ” 25Mosis biliri jekwuru Datan na Abiram, ndị okenye Izrel sokwa Mosis. 26Mgbe Mosis ruru nʼebe ahụ, ọ dọrọ nzukọ Izrel aka na ntị sị, “Ngwa, sinụ nʼụlọ ndị ọjọọ a wezuga onwe unu. Unu ebitụkwala ihe ọbụla bụ nke ha aka. Ma ọ bụghị otu a, a ga-agụnyekọ unu na mmehie ha, lakọọ unu na ha nʼiyi.” 27Ya mere mmadụ niile wezugara onwe ha site nʼọmụma ụlọ ikwu Kora, na Datan na Abiram. Ma Datan na Abiram pụtara guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha, ha onwe ha na ndị nwunye ha niile, na ụmụ ha niile, na ụmụntakịrị ha niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.