Native Bible

Numbers 16:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Gwa nzukọ Izrel niile sị ha, ‘Wezuganụ onwe unu site nʼụlọ ikwu Kora, Datan na Abiram.’ ”

Numbers 16:24 in English

Numbers 16:24 · Berean Standard Bible

“Tell the congregation to move away from the dwellings of Korah, Dathan, and Abiram.”

Context

22Ma Mosis na Erọn dara kpuo ihu nʼala nʼihu Onyenwe anyị rịọọ ya sị, “O Chineke, gị bụ Chineke nwe ndụ mmadụ niile, ị ga-ewe iwe megide nzukọ niile nʼihi mmehie otu onye?” 23Ma Onyenwe anyị zara Mosis sị ya, 24“Gwa nzukọ Izrel niile sị ha, ‘Wezuganụ onwe unu site nʼụlọ ikwu Kora, Datan na Abiram.’ ” 25Mosis biliri jekwuru Datan na Abiram, ndị okenye Izrel sokwa Mosis. 26Mgbe Mosis ruru nʼebe ahụ, ọ dọrọ nzukọ Izrel aka na ntị sị, “Ngwa, sinụ nʼụlọ ndị ọjọọ a wezuga onwe unu. Unu ebitụkwala ihe ọbụla bụ nke ha aka. Ma ọ bụghị otu a, a ga-agụnyekọ unu na mmehie ha, lakọọ unu na ha nʼiyi.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.