Ọnụọgụgụ 15:7
Numbers 15:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
tinyekwa ya mmanya jitụ ihe nta karịa otu lita ka ọ bụrụ onyinye ihe ọṅụṅụ nye ha, dịka aja nke isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị.
Numbers 15:7 in English
Numbers 15:7 · Berean Standard Bible
and a third of a hin of wine as a drink offering, a pleasing aroma to the LORD.
Context
5Ọ ga-eweta otu lita mmanya dịka onyinye ihe ọṅụṅụ maka nwa atụrụ ọbụla e ji chụọ aja nsure ọkụ maọbụ aja ụzọ. 6“ ‘Ọ bụrụ nwa ebule ka e ji achụ aja ahụ, weta lita ezi ụtụ ọka anọ na ọkara, nke a gwakọtara ya na mmanụ jitụ ntakịrị karịa otu lita, 7tinyekwa ya mmanya jitụ ihe nta karịa otu lita ka ọ bụrụ onyinye ihe ọṅụṅụ nye ha, dịka aja nke isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị. 8“ ‘Mgbe i ji nwa oke ehi chụọ aja nsure ọkụ, maọbụ aja imezu nkwa, maọbụ aja udo nye Onyenwe anyị, 9tinyere oke ehi ahụ, ị ghaghị iji ezi ụtụ ọka ruru lita isii na ọkara, nke a gwakọtara ya na mmanụ ruru lita abụọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.