Native Bible

Numbers 15:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

tinyere oke ehi ahụ, ị ghaghị iji ezi ụtụ ọka ruru lita isii na ọkara, nke a gwakọtara ya na mmanụ ruru lita abụọ.

Numbers 15:9 in English

Numbers 15:9 · Berean Standard Bible

present with the bull a grain offering of three-tenths of an ephah of fine flour * mixed with half a hin of olive oil.*

Context

7tinyekwa ya mmanya jitụ ihe nta karịa otu lita ka ọ bụrụ onyinye ihe ọṅụṅụ nye ha, dịka aja nke isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị. 8“ ‘Mgbe i ji nwa oke ehi chụọ aja nsure ọkụ, maọbụ aja imezu nkwa, maọbụ aja udo nye Onyenwe anyị, 9tinyere oke ehi ahụ, ị ghaghị iji ezi ụtụ ọka ruru lita isii na ọkara, nke a gwakọtara ya na mmanụ ruru lita abụọ. 10Wetakwa lita mmanya abụọ nke ga-abụ onyinye ihe ọṅụṅụ. Ọ ga-abụ onyinye e sitere nʼọkụ nye, nke isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị. 11Nke a bụ usoro a ga-agbaso nʼoge ọbụla e ji nwa oke ehi, maọbụ nwa ebule, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ nwa ewu chụọ aja.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.