Native Bible

Numbers 11:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere ndị Izrel biliri ụbọchị ahụ niile, na nʼabalị ahụ niile, na echi ya niile pụọ ịchịkọta nnụnụ kweel ndị a! Onye gbutere nke nta gbutezuru ihe ọtụtụ homa iri. Ha gbasara ha akụkụ niile nke ogige ọmụma ụlọ ikwu ahụ.

Numbers 11:32 in English

Numbers 11:32 · Berean Standard Bible

All that day and night, and all the next day, the people stayed up gathering the quail. No one gathered less than ten homers,* and they spread them out all around the camp.

Context

30Mgbe ahụ Mosis na ndị okenye Izrel ndị ahụ niile lọghachiri nʼebe ụlọ ikwu ha dị. 31Otu oke ifufe sitere nʼebe Onyenwe anyị nọ bịa si nʼosimiri bute ọtụtụ nnụnụ a na-akpọ kweel. O mere ka nnụnụ ndị a daa nʼebe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha, nʼime ogige ya niile. Nnụnụ ndị a fere ihe dịka otu mita site nʼelu ala, nʼakụkụ niile, ruo nʼebe mmadụ pụrụ iji ụkwụ jeruo nʼotu ụbọchị. Ha jupụtakwara ebe niile. 32Ya mere ndị Izrel biliri ụbọchị ahụ niile, na nʼabalị ahụ niile, na echi ya niile pụọ ịchịkọta nnụnụ kweel ndị a! Onye gbutere nke nta gbutezuru ihe ọtụtụ homa iri. Ha gbasara ha akụkụ niile nke ogige ọmụma ụlọ ikwu ahụ. 33Ma mgbe anụ ndị a ka dị ha nʼọnụ, Onyenwe anyị were iwe dị ukwuu megide ha. O tiri ha nrịa nrịa na-efe efe. 34Nʼihi nke a, a kpọrọ aha ebe ahụ Kibrọt Hataava, nʼihi na nʼebe ahụ ka e liri ndị Izrel nwụrụ nʼihi oke ọchịchọ nri.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.