Native Bible

Numbers 1:53 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị Livayị ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ụlọ nzute Ihe Ama ahụ, ka iwe ọkụ m ghara ịbịakwasị nʼahụ nzukọ ụmụ Izrel. Ọ bụ ọrụ ndị Livayị ilekọta ụlọ nzute Ihe Ama ahụ.”

Numbers 1:53 in English

Numbers 1:53 · Berean Standard Bible

But the Levites are to camp around the tabernacle of the Testimony and watch over it, so that no wrath will fall on the congregation of Israel. So the Levites are responsible for the tabernacle of the Testimony.”

Context

51Mgbe ọbụla kwa a ga-ebugharị ya maka njem, ọ bụ ọrụ ha iweda ya. Mgbe ọbụla a ga-eguzo ya ọtọ, ọ bụkwa ọrụ ndị Livayị iguzobe ya ọtọ. Onye ọbụla ọzọ ga-abịa nso ka a ga-egbu. 52Ebo Izrel ndị ọzọ ga-enwe ebe dị iche nye onwe ha, ebe ha ga-ewu ụlọ ikwu ha. Ha ga-akwụbakwa ọkọlọtọ nke ha, igosi aha ebo ha. 53Ndị Livayị ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ụlọ nzute Ihe Ama ahụ, ka iwe ọkụ m ghara ịbịakwasị nʼahụ nzukọ ụmụ Izrel. Ọ bụ ọrụ ndị Livayị ilekọta ụlọ nzute Ihe Ama ahụ.” 54Ya mere, Izrel mere ihe ndị a niile Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. 1:1 Nke a bụ otu ọnwa site nʼoge ụmụ Izrel si Ijipt rute nʼọzara Saịnaị, Ọpụ 9:1 otu ọnwa mgbe arụchara ụlọ nzute ahụ nʼọzara, Ọpụ 40:17 bụrụkwa mgbe abalị iri na ise gafesịrị site nʼoge ha mere ncheta Mmemme Ngabiga nʼọzara Saịnaị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.