Native Bible

Numbers 1:52 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ebo Izrel ndị ọzọ ga-enwe ebe dị iche nye onwe ha, ebe ha ga-ewu ụlọ ikwu ha. Ha ga-akwụbakwa ọkọlọtọ nke ha, igosi aha ebo ha.

Numbers 1:52 in English

Numbers 1:52 · Berean Standard Bible

The Israelites are to camp by their divisions, each man in his own camp and under his own standard.

Context

50Kama, ị ga-ahọpụta ndị Livayị ka ha bụrụ ndị nlekọta ụlọ nzute Ihe Ama, na ngwongwo niile, na ihe niile dị nye ya. Ọ bụ ha ga-ebu ụlọ nzute ahụ na ngwongwo ya niile: ha ga na-elekọta ihe banyere ya, ọ bụkwa gburugburu ya ka ha ga-ama ụlọ ikwu ha. 51Mgbe ọbụla kwa a ga-ebugharị ya maka njem, ọ bụ ọrụ ha iweda ya. Mgbe ọbụla a ga-eguzo ya ọtọ, ọ bụkwa ọrụ ndị Livayị iguzobe ya ọtọ. Onye ọbụla ọzọ ga-abịa nso ka a ga-egbu. 52Ebo Izrel ndị ọzọ ga-enwe ebe dị iche nye onwe ha, ebe ha ga-ewu ụlọ ikwu ha. Ha ga-akwụbakwa ọkọlọtọ nke ha, igosi aha ebo ha. 53Ndị Livayị ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ụlọ nzute Ihe Ama ahụ, ka iwe ọkụ m ghara ịbịakwasị nʼahụ nzukọ ụmụ Izrel. Ọ bụ ọrụ ndị Livayị ilekọta ụlọ nzute Ihe Ama ahụ.” 54Ya mere, Izrel mere ihe ndị a niile Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. 1:1 Nke a bụ otu ọnwa site nʼoge ụmụ Izrel si Ijipt rute nʼọzara Saịnaị, Ọpụ 9:1 otu ọnwa mgbe arụchara ụlọ nzute ahụ nʼọzara, Ọpụ 40:17 bụrụkwa mgbe abalị iri na ise gafesịrị site nʼoge ha mere ncheta Mmemme Ngabiga nʼọzara Saịnaị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.