Native Bible

Nehemiah 3:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye na-eso ha bụ Refaya nwa Hua onyeisi ọchịchị otu akụkụ Jerusalem.

Nehemiah 3:9 in English

Nehemiah 3:9 · Berean Standard Bible

Next to them, Rephaiah son of Hur, ruler of a half-district of Jerusalem, made repairs;

Context

7Ndị ọzọ rụrụ ọrụ nʼakụkụ ha bụ Melataya, onye Gibiọn, na Jadon onye Meronot, na ndị si Gibiọn na Mizpa. Obodo ndị a dị nʼokpuru onyeisi ọchịchị akụkụ ọdịda anyanwụ Yufretis. 8Uziel nwa Hahaya, bụ ọkpụ ụzụ ọlaedo, doziri otu akụkụ. Onye na-eso ya bụ Hananaya, otu onye nʼime ndị na-eme mmanụ otite na-esi isi ọma, doziri nke na-esote nke ahụ. Ha doziri Jerusalem ruruo ya na Mgbidi Obosara. 9Onye na-eso ha bụ Refaya nwa Hua onyeisi ọchịchị otu akụkụ Jerusalem. 10Onye na-eso ya bụ Jedaya nwa Harumaf, onye rụrụ akụkụ mgbidi ahụ chere ihu nʼụlọ nke aka ya. Onye na-eso ya nʼọrụ a bụ Hatush nwa Hashabneia. 11Onye ọzọ bụ Malkija nwa Harim, na Hashub nwa Pahat-Moab, ndị wugharịrị ụlọ elu ọkụ, na otu akụkụ mgbidi ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.