Nehemaya 3:10
Nehemiah 3:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye na-eso ya bụ Jedaya nwa Harumaf, onye rụrụ akụkụ mgbidi ahụ chere ihu nʼụlọ nke aka ya. Onye na-eso ya nʼọrụ a bụ Hatush nwa Hashabneia.
Nehemiah 3:10 in English
Nehemiah 3:10 · Berean Standard Bible
next to him, Jedaiah son of Harumaph made repairs across from his house; and next to him, Hattush son of Hashabneiah made repairs.
Context
8Uziel nwa Hahaya, bụ ọkpụ ụzụ ọlaedo, doziri otu akụkụ. Onye na-eso ya bụ Hananaya, otu onye nʼime ndị na-eme mmanụ otite na-esi isi ọma, doziri nke na-esote nke ahụ. Ha doziri Jerusalem ruruo ya na Mgbidi Obosara. 9Onye na-eso ha bụ Refaya nwa Hua onyeisi ọchịchị otu akụkụ Jerusalem. 10Onye na-eso ya bụ Jedaya nwa Harumaf, onye rụrụ akụkụ mgbidi ahụ chere ihu nʼụlọ nke aka ya. Onye na-eso ya nʼọrụ a bụ Hatush nwa Hashabneia. 11Onye ọzọ bụ Malkija nwa Harim, na Hashub nwa Pahat-Moab, ndị wugharịrị ụlọ elu ọkụ, na otu akụkụ mgbidi ahụ. 12Shalum nwa Halohesh na ụmụ ya ndị inyom meziri akụkụ mgbidi nke na-esota. Ọ bụ onyeisi ọchịchị otu akụkụ Jerusalem nke ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.