Native Bible

Nehemiah 3:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Shalum nwa Halohesh na ụmụ ya ndị inyom meziri akụkụ mgbidi nke na-esota. Ọ bụ onyeisi ọchịchị otu akụkụ Jerusalem nke ọzọ.

Nehemiah 3:12 in English

Nehemiah 3:12 · Berean Standard Bible

And next to them, Shallum son of Hallohesh, ruler of the other half-district of Jerusalem, made repairs, with the help of his daughters.

Context

10Onye na-eso ya bụ Jedaya nwa Harumaf, onye rụrụ akụkụ mgbidi ahụ chere ihu nʼụlọ nke aka ya. Onye na-eso ya nʼọrụ a bụ Hatush nwa Hashabneia. 11Onye ọzọ bụ Malkija nwa Harim, na Hashub nwa Pahat-Moab, ndị wugharịrị ụlọ elu ọkụ, na otu akụkụ mgbidi ahụ. 12Shalum nwa Halohesh na ụmụ ya ndị inyom meziri akụkụ mgbidi nke na-esota. Ọ bụ onyeisi ọchịchị otu akụkụ Jerusalem nke ọzọ. 13Hanun duuru ndị obodo Zanoa wuo Ọnụ Ụzọ Ndagwurugwu. Ha wuziri ya, tinye ibo ya, ihe mkpọchi ya na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha. Ha wuzikwara mpaghara ahụ nke ịdị ogologo ya ruru narị mita ise, ruo nʼọnụ ụzọ ama dị nʼebe a na-ekpofu ahịhịa. 14Malkija nwa Rekab, onyeisi ọchịchị ala nke dị Bet-Hakerem gburugburu, bụ onye wuziri ọnụ ụzọ ama dị nʼebe ikpofu ahịhịa. O tinyere ibo ya, ihe mkpọchi ya na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.