Nehemaya 2:11
Nehemiah 2:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E rutere m Jerusalem, nọdụkwa ebe ahụ mkpụrụ ụbọchị atọ,
Nehemiah 2:11 in English
Nehemiah 2:11 · Berean Standard Bible
After I had arrived in Jerusalem and had been there three days,
Context
9Mgbe m rutere obodo ndị a dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis, enyere m ndịisi ọchịchị niile akwụkwọ ahụ eze dere nye m. Eze dunyere m ndịisi agha na ndị agha na-agba ịnyịnya ka ha chebe m nʼije m. 10Ma mgbe Sanbalat,* onye Horonaim, na Tobaya, onye Amọn bụ onyeisi ọrụ ọchịchị, nụrụ ihe banyere ọbịbịa m, iwe were ha nke ukwuu ịnụ na o nwere onye na-achọ inyere ndị Izrel aka. 11E rutere m Jerusalem, nọdụkwa ebe ahụ mkpụrụ ụbọchị atọ, 12eji m abalị pụọ kpọrọ mmadụ ole na ole. O nwebeghị onye ọbụla m gwara ihe Chineke tinyere m nʼobi ime na Jerusalem. Ọ dịghị ịnyịnya ọzọ anyị ji ma ọ bụghị nke ahụ m na-agba. 13Nʼabalị a pụrụ m site nʼỌnụ ụzọ ama Ndagwurugwu* ruo nʼisi iyi mmiri Nkịta ọhịa,* sitekwa nʼebe ahụ ruo nʼỌnụ ụzọ ama ebe ikpofu ahịhịa.* Anyị jegharịrị ịhụ ebe niile mgbidi Jerusalem dara ada, na ọnụ ụzọ ama ya niile nke ọkụ rere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.