Nehemaya 2:12
Nehemiah 2:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
eji m abalị pụọ kpọrọ mmadụ ole na ole. O nwebeghị onye ọbụla m gwara ihe Chineke tinyere m nʼobi ime na Jerusalem. Ọ dịghị ịnyịnya ọzọ anyị ji ma ọ bụghị nke ahụ m na-agba.
Nehemiah 2:12 in English
Nehemiah 2:12 · Berean Standard Bible
I set out at night with a few men. I did not tell anyone what my God had laid on my heart to do for Jerusalem. The only animal with me was the one on which I was riding.
Context
10Ma mgbe Sanbalat,* onye Horonaim, na Tobaya, onye Amọn bụ onyeisi ọrụ ọchịchị, nụrụ ihe banyere ọbịbịa m, iwe were ha nke ukwuu ịnụ na o nwere onye na-achọ inyere ndị Izrel aka. 11E rutere m Jerusalem, nọdụkwa ebe ahụ mkpụrụ ụbọchị atọ, 12eji m abalị pụọ kpọrọ mmadụ ole na ole. O nwebeghị onye ọbụla m gwara ihe Chineke tinyere m nʼobi ime na Jerusalem. Ọ dịghị ịnyịnya ọzọ anyị ji ma ọ bụghị nke ahụ m na-agba. 13Nʼabalị a pụrụ m site nʼỌnụ ụzọ ama Ndagwurugwu* ruo nʼisi iyi mmiri Nkịta ọhịa,* sitekwa nʼebe ahụ ruo nʼỌnụ ụzọ ama ebe ikpofu ahịhịa.* Anyị jegharịrị ịhụ ebe niile mgbidi Jerusalem dara ada, na ọnụ ụzọ ama ya niile nke ọkụ rere. 14Emesịa, ejeruru m ọnụ ụzọ nke dị nʼebe isi iyi dị, ruokwa nʼọdọ mmiri eze, ma ịnyịnya ibu m enweghị ike isite nʼebe ahụ gafee.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.