Native Bible

Nehemiah 13:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, ndị na-azụ ahịa na ndị na-ere ụdị ngwa ahịa dị iche iche, na-anọ ọnọdụ abalị nʼazụ Jerusalem, otu gboro maọbụ ugboro abụọ.

Nehemiah 13:20 in English

Nehemiah 13:20 · Berean Standard Bible

Once or twice, the merchants and those who sell all kinds of goods camped outside Jerusalem,

Context

18Ọ bụghị otu ihe a ka nna nna unu ha mere, nke mere na Chineke wetara ọdachi a tụkwasị anyị nakwa obodo a? Ugbu a, unu na-akpali ọnụma tụkwasị na nke dị megide Izrel site nʼimerụ ụbọchị izuike?” 19Nʼihi nke a, enyere m iwu na a ga-emechi ọnụ ụzọ ama Jerusalem nʼuhuruchi tupu ụbọchị izuike, ruo mgbe ụbọchị izuike gafesịrị. Emere m ka ụfọdụ ndị ohu m na-anọ na nche nʼebe ahụ, ịhụ na ọ dịghị onye ahịa ọbụla ga-abata nʼime obodo Jerusalem nʼụbọchị izuike. 20Ya mere, ndị na-azụ ahịa na ndị na-ere ụdị ngwa ahịa dị iche iche, na-anọ ọnọdụ abalị nʼazụ Jerusalem, otu gboro maọbụ ugboro abụọ. 21Ma a dọrọ ha aka na ntị, sị, “Gịnị ka unu ji na-anọ ọnọdụ abalị nʼakụkụ mgbidi a? Ọ bụrụ na unu eme ya ọzọ, aga m enye iwu ka e jide unu.” Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ha abịakwaghị ọzọ nʼụbọchị izuike. 22Mgbe ahụ, enyere m ndị Livayị iwu ka ha doo onwe ha ọcha, nọọkwa na nche nʼọnụ ụzọ ama, ịhụ na onye ọbụla doro ụbọchị izuike nsọ. Chineke m, biko, cheta m nʼihi ihe ọma ndị a niile, nwee amara nʼebe m nọ, dịka ịba ụba nke obi ebere gị si dị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.