Native Bible

Nehemiah 13:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, enyere m ndị Livayị iwu ka ha doo onwe ha ọcha, nọọkwa na nche nʼọnụ ụzọ ama, ịhụ na onye ọbụla doro ụbọchị izuike nsọ. Chineke m, biko, cheta m nʼihi ihe ọma ndị a niile, nwee amara nʼebe m nọ, dịka ịba ụba nke obi ebere gị si dị.

Nehemiah 13:22 in English

Nehemiah 13:22 · Berean Standard Bible

Then I instructed the Levites to purify themselves and guard the gates in order to keep the Sabbath day holy. Remember me for this as well, O my God, and show me mercy according to Your abundant loving devotion.

Context

20Ya mere, ndị na-azụ ahịa na ndị na-ere ụdị ngwa ahịa dị iche iche, na-anọ ọnọdụ abalị nʼazụ Jerusalem, otu gboro maọbụ ugboro abụọ. 21Ma a dọrọ ha aka na ntị, sị, “Gịnị ka unu ji na-anọ ọnọdụ abalị nʼakụkụ mgbidi a? Ọ bụrụ na unu eme ya ọzọ, aga m enye iwu ka e jide unu.” Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ha abịakwaghị ọzọ nʼụbọchị izuike. 22Mgbe ahụ, enyere m ndị Livayị iwu ka ha doo onwe ha ọcha, nọọkwa na nche nʼọnụ ụzọ ama, ịhụ na onye ọbụla doro ụbọchị izuike nsọ. Chineke m, biko, cheta m nʼihi ihe ọma ndị a niile, nwee amara nʼebe m nọ, dịka ịba ụba nke obi ebere gị si dị. 23Ọzọ, nʼụbọchị ndị ahụ a hụrụ m ndị ikom Juda ndị lụtara ndị inyom site nʼetiti ndị Ashdọd, na ndị Amọn, na ndị Moab, 24chọpụtakwa na ọkara nʼetiti ụmụ ha na-asụ naanị asụsụ ndị Ashdọd, maọbụ otu asụsụ nke ndị mba ọzọ, ma ha amaghị asụsụ Juda ma ọlị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.