Native Bible

Nehemiah 13:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụghị otu ihe a ka nna nna unu ha mere, nke mere na Chineke wetara ọdachi a tụkwasị anyị nakwa obodo a? Ugbu a, unu na-akpali ọnụma tụkwasị na nke dị megide Izrel site nʼimerụ ụbọchị izuike?”

Nehemiah 13:18 in English

Nehemiah 13:18 · Berean Standard Bible

Did not your forefathers do the same things, so that our God brought all this disaster on us and on this city? And now you are rekindling His wrath against Israel by profaning the Sabbath!”

Context

16Ndị si obodo Taịa, bụ ndị birila na Jerusalem nọ na-ebubata azụ na ngwa ahịa ndị ọzọ dị iche iche, na-ere ha na Juda, nakwa na Jerusalem nʼụbọchị izuike. 17A baara m ndị a na-asọpụrụ na Juda mba, si ha, “Gịnị bụ ihe ọjọọ nke a unu na-eme, na-emerụ ụbọchị izuike? 18Ọ bụghị otu ihe a ka nna nna unu ha mere, nke mere na Chineke wetara ọdachi a tụkwasị anyị nakwa obodo a? Ugbu a, unu na-akpali ọnụma tụkwasị na nke dị megide Izrel site nʼimerụ ụbọchị izuike?” 19Nʼihi nke a, enyere m iwu na a ga-emechi ọnụ ụzọ ama Jerusalem nʼuhuruchi tupu ụbọchị izuike, ruo mgbe ụbọchị izuike gafesịrị. Emere m ka ụfọdụ ndị ohu m na-anọ na nche nʼebe ahụ, ịhụ na ọ dịghị onye ahịa ọbụla ga-abata nʼime obodo Jerusalem nʼụbọchị izuike. 20Ya mere, ndị na-azụ ahịa na ndị na-ere ụdị ngwa ahịa dị iche iche, na-anọ ọnọdụ abalị nʼazụ Jerusalem, otu gboro maọbụ ugboro abụọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.