Nehemaya 13:12
Nehemiah 13:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị Juda niile bidokwara iweta ụtụ ha, na onyinye ọka, na mmanya vaịnị na mmanụ oliv ha nʼụlọ ịchịkọba ihe dị nʼụlọnsọ.
Nehemiah 13:12 in English
Nehemiah 13:12 · Berean Standard Bible
and all Judah brought a tenth of the grain, new wine, and oil into the storerooms.
Context
10A chọpụtakwara m na-enyebeghị ndị Livayị oke ihe ruru ha, nke mere na ndị ọbụ abụ, na ndị nche ndị ọ bụ ọrụ ha i doo ofufe, alaghachila nʼubi ha dị iche iche. 11Nʼihi ya, abaara m ha mba jụọ ha si: “Gịnị mere unu jiri gbakụta ụlọnsọ ukwu Chineke azụ?” Mgbe ahụ akpọghachiri m ndị Livayị nyekwa ha ọrụ ha nʼụlọnsọ. 12Ndị Juda niile bidokwara iweta ụtụ ha, na onyinye ọka, na mmanya vaịnị na mmanụ oliv ha nʼụlọ ịchịkọba ihe dị nʼụlọnsọ. 13E tinyere m Shelemaya onye nchụaja, na Zadọk ode akwụkwọ, na Pedaia onye Livayị, ka ha bụrụ ndị na-elekọta ụlọ ịchịkọba ihe niile ahụ. Emekwara m Hanan nwa Zakua, nwa Matanaya, onye ga na-enyere ha aka, nʼihi na a gụrụ ha dịka ndị kwesiri ntụkwasị obi. Ọrụ ha bụ ikere ndị Livayị ibe ha niile oke. 14Chineke m, biko cheta m nʼihi nke a, ehichapụkwala ihe niile m ji obi m niile rụọ nʼụlọnsọ gị na ije ozi niile ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.