Native Bible

Mark 7:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na ọ bụ nʼime obi mmadụ ka echiche ọjọọ niile si apụta, ya na ịkwa iko niile dị iche iche, izu ohi, igbu mmadụ,

Mark 7:21 in English

Mark 7:21 · Berean Standard Bible

For from within the hearts of men come evil thoughts, sexual immorality, theft, murder, adultery,*

Context

19Nʼihi na ihe dị otu a anaghị abanye nʼobi ha, kama ọ na-abanye nʼime afọ ha, si nʼebe ahụ a nyụpụ ya nʼụlọ nsị.” (Site nʼikwu otu a, o mere ka ihe oriri niile dị ọcha.) 20Ọ sịkwara, “Ọ bụ ihe sitere nʼime mmadụ pụta na-emerụ ya. 21Nʼihi na ọ bụ nʼime obi mmadụ ka echiche ọjọọ niile si apụta, ya na ịkwa iko niile dị iche iche, izu ohi, igbu mmadụ, 22ịkwa iko nke ndị nwere di na nwunye, ọchịchọ ịdọtara onwe gị ihe ndị ọzọ nwere, ekworo, aghụghọ niile, adịghị ọcha niile, inwe anya ụfụ nʼebe ndị ọzọ nọ, nkwulu niile, nganga na enweghị uche ọbụla. 23Ihe ọjọọ ndị a niile na-esite nʼime mmadụ a pụta. Ha bụkwa ihe na-emerụ mmadụ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.