Mak 6:43
Mark 6:43 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha tụtụkọtara iberibe achịcha na azụ tụtụjuo nkata iri na abụọ.
Mark 6:43 in English
Mark 6:43 · Berean Standard Bible
and the disciples picked up twelve basketfuls of broken pieces of bread and fish.
Context
41Ọ naara ogbe achịcha ise na azụ abụọ ndị ahụ, welie anya ya elu, nye ekele. Ọ nyawara achịcha ahụ nye ya ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ndị mmadụ ahụ. Otu aka ahụkwa ọ nyawakwara azụ abụọ ahụ nyekwa ha niile. 42Ha niile riri rijuo afọ. 43Ha tụtụkọtara iberibe achịcha na azụ tụtụjuo nkata iri na abụọ. 44Ọnụọgụgụ ndị nwoke riri ogbe achịcha ahụ dị puku mmadụ ise. 45Ngwangwa, o mere ka ndị na-eso ụzọ ya banye nʼụgbọ mmiri buru ya ụzọ gafee nʼofe nke ọzọ nke osimiri Betsaida, ebe ya onwe ya nọdụrụ izilaga igwe mmadụ ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.