Native Bible

Mark 3:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụrụ na alaeze ekewa megide onwe ya alaeze ahụ apụghị iguzo.

Mark 3:24 in English

Mark 3:24 · Berean Standard Bible

If a kingdom is divided against itself, it cannot stand.

Context

22Ma ndị ozizi iwu si Jerusalem bịa sịrị, “Mmụọ Belzebub bi nʼime ya! Ọ bụkwa nʼike onyeisi ndị mmụọ ọjọọ ka o ji achụpụ mmụọ ọjọọ.” 23Ma ọ kpọrọ ha jiri ilu gwa ha okwu sị, “Ekwensu ọ pụrụ ịchụpụ ekwensu? 24Ọ bụrụ na alaeze ekewa megide onwe ya alaeze ahụ apụghị iguzo. 25Ọ bụrụ na ezinaụlọ ekewa megide onwe ya, ezinaụlọ ahụ apụghị iguzo. 26Ọ bụrụkwa na ekwensu ebilie megide onwe ya si otu a nwee nkewa, o nweghị ike iguzo; kama ọgwụgwụ oge ya abịala nso.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.