Mak 15:24
Mark 15:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Emesịa, ha kpọgidere ya nʼobe, ma kee uwe ya nʼetiti onwe ha site nʼife nza onye ga-enwe nke ọ ga-ewe.
Mark 15:24 in English
Mark 15:24 · Berean Standard Bible
And they crucified Him. They also divided His garments by casting lots to decide what each of them would take.*
Context
22Nʼikpeazụ, ha duuru Jisọs ruo ebe a na-akpọ Gọlgọta (nke pụtara “ebe okpokoro isi”). 23Ha nyere ya mmanya a gwara máá, ma ọ jụrụ ịṅụ ya. 24Emesịa, ha kpọgidere ya nʼobe, ma kee uwe ya nʼetiti onwe ha site nʼife nza onye ga-enwe nke ọ ga-ewe. 25Ha kpọgidere ya nʼobe nʼelekere itoolu nke ụtụtụ. 26Ha depụtara ebubo ha boro ya kwụba ya nʼelu obe ahụ, nke bụ:
Eze ndị Juu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.