Mak 14:48
Mark 14:48 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jisọs sịrị ha, “Abụ m onyendu nke ndị na-enupu isi nke mere unu ji were mma agha na mkpọ bịa ijide m?
Mark 14:48 in English
Mark 14:48 · Berean Standard Bible
Jesus asked the crowd, “Have you come out with swords and clubs to arrest Me as you would an outlaw?
Context
46Ndị ikom ahụ jidere Jisọs ma sekpụrụ ya nʼike. 47Ma otu onye nʼime ndị guzo nʼebe ahụ, mịpụtara mma agha ya, gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị ya. 48Jisọs sịrị ha, “Abụ m onyendu nke ndị na-enupu isi nke mere unu ji were mma agha na mkpọ bịa ijide m? 49Ụbọchị niile ka mụ na unu nọ mgbe m na-ezi ihe nʼụlọnsọ ukwu, ma unu ejideghị m. Ma ihe akwụkwọ nsọ kwuru aghaghị imezu.” 50Mgbe ahụ, ha niile hapụrụ ya gbalaga.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.