Native Bible

Mark 14:46 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị ikom ahụ jidere Jisọs ma sekpụrụ ya nʼike.

Mark 14:46 in English

Mark 14:46 · Berean Standard Bible

Then the men seized Jesus and arrested Him.

Context

44Ma onye na-arara ya nye, nyere ha rịị ihe ịrịbama sị, “Onye ahụ nke m ga-esutu ọnụ bụ ya; jidenụ ya, kpụrụnụ ya gawa, ma jidesiekwanụ ya ike.” 45Ngwangwa o jekwuuru Jisọs, sị ya, “Onye ozizi!” ma sutukwa ya ọnụ. 46Ndị ikom ahụ jidere Jisọs ma sekpụrụ ya nʼike. 47Ma otu onye nʼime ndị guzo nʼebe ahụ, mịpụtara mma agha ya, gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị ya. 48Jisọs sịrị ha, “Abụ m onyendu nke ndị na-enupu isi nke mere unu ji were mma agha na mkpọ bịa ijide m?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.