Mak 13:20
Mark 13:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ọ bụrụ na Onyenwe anyị emeghị ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ, ọ dịghị onye a ga-azọpụta. Ma nʼihi ndị ya, ndị ọ họpụtara, o meela ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ.
Mark 13:20 in English
Mark 13:20 · Berean Standard Bible
If the Lord had not cut short those days, nobody would be saved. But for the sake of the elect, whom He has chosen, He has cut them short.
Context
18Kpeenụ ekpere ka ihe ndị a hapụ ime nʼoge oke oyi. 19Nʼihi na oke mkpagbu nke ụbọchị ahụ ga-abụ nke na-adịbeghị na mbụ site na mgbe Chineke kere ụwa ruo ugbu a. Ọ dịkwaghị ihe ga-adịkwa ka ya ọzọ ruo mgbe ebighị ebi. 20“Ọ bụrụ na Onyenwe anyị emeghị ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ, ọ dịghị onye a ga-azọpụta. Ma nʼihi ndị ya, ndị ọ họpụtara, o meela ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ. 21Nʼoge ahụ, ọ bụrụ na onye ọbụla asị unu, ‘Lee, Kraịst nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘Lee, ọ nọ nʼebe ahụ,’ unu ekwela. 22Nʼihi na ndị nzọpụta ụgha na ndị amụma ụgha, ga-apụta ma rụọkwa ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị iche iche iji duhie ndị a họpụtara ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.