Mak 10:36
Mark 10:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?”
Mark 10:36 in English
Mark 10:36 · Berean Standard Bible
“What do you want Me to do for you?” He inquired.
Context
34Ha ga-akwa ya emo, gbụsakwa ya ọnụ mmiri asụ, pịa ya ihe ma gbukwaa ya. Ma mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ọ ga-esite nʼọnwụ bilie.” 35Jemis na Jọn ụmụ Zebedi bịakwutere ya. Ha sịrị ya, “Onye ozizi, anyị chọrọ ka i meere anyị ihe ọbụla anyị rịọrọ.” 36Ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?” 37Ha sịrị ya, “Kwere ka otu onye nʼime anyị nọrọ nʼaka nri gị, onye nke ọzọ nʼaka ekpe gị nʼime ebube gị.” 38Ma Jisọs sịrị ha, “Unu amataghị ihe unu na-arịọ. Unu pụrụ ịṅụ iko ahụ mụ onwe m ga-aṅụ maọbụ bụrụ ndị a ga-eme ụdị baptizim a ga-eme m?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.