Mark 1:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jọn omee baptizim pụtara na-eme baptizim nʼọzara, ma na-ekwusa baptizim nke nchegharị maka mgbaghara mmehie.
Mark 1:4 in English
Mark 1:4 · Berean Standard Bible
John the Baptist appeared in the wilderness, preaching a baptism of repentance for the forgiveness of sins.
Context
2Dịka e dere ya rịị nʼakwụkwọ Aịzaya onye amụma sị,
“Aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị,
onye ga-edozi ụzọ gị.”* 3“Otu onye na-eti mkpu nʼọzara, na-asị,
‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị,
meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.’ ”* 4Jọn omee baptizim pụtara na-eme baptizim nʼọzara, ma na-ekwusa baptizim nke nchegharị maka mgbaghara mmehie. 5Ndị mmadụ si nʼakụkụ Judịa niile na ndị niile bi na Jerusalem pụrụ jekwuru ya. Ka ha na-ekwupụta mmehie ha, o mere ha baptizim nʼosimiri Jọdan. 6Uwe Jọn yi nʼahụ ya bụ nke e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike e ji akpụkpọ anụ mee nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.