Matiu 8:23
Matthew 8:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ọ banyere nʼụgbọ, ndị na-eso ụzọ ya sooro ya.
Matthew 8:23 in English
Matthew 8:23 · Berean Standard Bible
When He got into the boat, His disciples followed Him.
Context
21Otu onye ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe m, aga m eso gị, kama kwere ka m buru ụzọ gaa lie nna m.” 22Ma Jisọs zara sị ya, “Soro m ugbu a. Hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie ndị nwụrụ anwụ ibe ha.” 23Mgbe ọ banyere nʼụgbọ, ndị na-eso ụzọ ya sooro ya. 24Nʼotu ntabi anya, oke ifufe bidoro ife nʼọdọ mmiri ahụ, nke mere na ebili mmiri na-ekpuchi ụgbọ ahụ. Ma ọ nọ na-arahụ ụra mgbe ihe ndị a na-eme. 25Ndị na-eso ụzọ ya jekwuuru ya, kpọtee ya, sị ya, “Onyenwe anyị, zọpụta anyị! Lee, na anyị nʼala nʼiyi.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.