Matiu 8:15
Matthew 8:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ metụrụ ya aka, ahụ ọkụ ahụ hapụrụ ya, o biliri malite ijere ya ozi.
Matthew 8:15 in English
Matthew 8:15 · Berean Standard Bible
So He touched her hand, and the fever left her, and she got up and began to serve them.
Context
13Jisọs gwara ọchịagha ahụ okwu sị ya, “Laa! E meerela gị dị ka okwukwe gị sịrị dị.” Ahụ dịrị onye ahụ na-ejere ya ozi mma nʼotu awa ahụ. 14Mgbe Jisọs ruru nʼụlọ Pita, ọ chọpụtara na nne nwunye ya nwere ahụ ọkụ. 15Ọ metụrụ ya aka, ahụ ọkụ ahụ hapụrụ ya, o biliri malite ijere ya ozi. 16Nʼoge uhuruchi, ha kpọtaara ya ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu. O ji okwu ọnụ chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ niile, gwọọkwa ndị niile ahụ na-adịghị ike. 17Nke a bụ imezu amụma ahụ Aịzaya buru sị,
“O bupụrụ nrịa nrịa anyị niile,
burukwa ọrịa anyị niile.”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.