Matiu 4:23
Matthew 4:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jisọs jegharịrị nʼobodo niile nke Galili, na-akụzi ihe nʼụlọ nzukọ niile ha, na-ekwusakwa oziọma nke alaeze ahụ. Ọ na-agwọkwa ọrịa na nrịa nrịa niile dị iche iche nʼetiti ndị ahụ.
Matthew 4:23 in English
Matthew 4:23 · Berean Standard Bible
Jesus went throughout Galilee, teaching in their synagogues, preaching the gospel of the kingdom, and healing every disease and sickness among the people.
Context
21Mgbe ọ gara nʼihu nke nta, ọ hụrụ ụmụnne abụọ ọzọ, Jemis nwa Zebedi na Jọn nwanne ya, ebe ha na nna ha Zebedi nọ nʼime ụgbọ mmiri na-ekezi ụgbụ azụ ha. Ọ kpọkwara ha, 22ngwangwa ha hapụrụ ụgbọ ha na nna ha soro ya. 23Jisọs jegharịrị nʼobodo niile nke Galili, na-akụzi ihe nʼụlọ nzukọ niile ha, na-ekwusakwa oziọma nke alaeze ahụ. Ọ na-agwọkwa ọrịa na nrịa nrịa niile dị iche iche nʼetiti ndị ahụ. 24Akụkọ banyere ya gbasara jezuo akụkụ Siria niile. Mgbe ahụ ọtụtụ ndị mmadụ kpọtaara ya ndị niile ahụ na-esighị ike, ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche, ndị nwere ahụ mgbu, na ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu, na ndị akwụkwụ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ gwọkwara ha niile. 25Ọtụtụ mmadụ sitere na Galili, Dekapọlịs,* Jerusalem, Judịa na nʼofe osimiri Jọdan, soro ya.
4:4 Achịcha nwere ike bụrụ nri
4:4 Okwu a dịkwa nʼakwụkwọ Dit 8:3.
4:6 Abụ 91:11,12
4:7 Gụọkwa ya nʼakwụkwọ Dit 6:16.
4:10 Nke a dịkwa nʼakwụkwọ Dit 6:13.
4:16 Aịz 9:1,2
4:25 Dekapọlịs pụtara Obodo iri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.