Native Bible

Matthew 3:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mịanụ mkpụrụ na-egosipụta nchegharị unu.

Matthew 3:8 in English

Matthew 3:8 · Berean Standard Bible

Produce fruit, then, in keeping with repentance.

Context

6Mgbe ha na-ekwupụta mmehie ha, o mere ha baptizim nʼosimiri Jọdan. 7Ma mgbe ọhụrụ ọtụtụ ndị Farisii na ndị Sadusii ka ha na-abịa ka e mee ha baptizim, ọ sịrị ha, “Unu ụmụ ajụala, onye dọrọ unu aka na ntị sị unu gbanarị ọnụma nke na-abịa? 8Mịanụ mkpụrụ na-egosipụta nchegharị unu. 9Unu echekwala na unu pụrụ ị sị nʼime onwe unu, ‘Anyị nwere Ebraham dịka nna,’ nʼihi na Chineke pụrụ isite na nkume ndị a mepụtara Ebraham ụmụ. 10Ma ugbu a atụkwasịla anyụike na mgbọrọgwụ osisi niile. Osisi ọbụla nke na-adịghị amị ezi mkpụrụ ka a ga-egbutu, tụba ya nʼime ọkụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.