Matiu 27:8
Matthew 27:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a mere e ji na-akpọ ala ahụ, “Ala Ọbara,”* ruo taa.
Matthew 27:8 in English
Matthew 27:8 · Berean Standard Bible
That is why it has been called the Field of Blood to this day.
Context
6Ndịisi nchụaja tụtụkọtara ego ahụ kwuo sị, “O megidere iwu itinye ego a nʼime ụlọakụ, nʼihi na ọ bụ ego ọbara.” 7Mgbe ha gbasịrị izu, ha kwekọtara ma were ego ahụ zụta ala nʼaka otu ọkpụ ite. Ha mere ala ahụ ka ọ bụrụ ebe a na-eli ndị ọbịa. 8Nke a mere e ji na-akpọ ala ahụ, “Ala Ọbara,”* ruo taa. 9Nʼụzọ dị otu a, okwu e kwuru site nʼọnụ Jeremaya onye amụma mezuru. “Ha tụtụkọtara mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ, bụ ọnụahịa onye ahụ, nke ụfọdụ nʼime ụmụ Izrel kpebiri na a ga-akwụ nʼisi ya. 10Ha ji ego ahụ zụọ ubi onye ọkpụ ite, dị ka Onyenwe anyị nyere m iwu.”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.