Matiu 27:10
Matthew 27:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ji ego ahụ zụọ ubi onye ọkpụ ite, dị ka Onyenwe anyị nyere m iwu.”*
Matthew 27:10 in English
Matthew 27:10 · Berean Standard Bible
and they gave them for the potter’s field, as the Lord had commanded me.”*
Context
8Nke a mere e ji na-akpọ ala ahụ, “Ala Ọbara,”* ruo taa. 9Nʼụzọ dị otu a, okwu e kwuru site nʼọnụ Jeremaya onye amụma mezuru. “Ha tụtụkọtara mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ, bụ ọnụahịa onye ahụ, nke ụfọdụ nʼime ụmụ Izrel kpebiri na a ga-akwụ nʼisi ya. 10Ha ji ego ahụ zụọ ubi onye ọkpụ ite, dị ka Onyenwe anyị nyere m iwu.”* 11Nʼoge a Jisọs guzo nʼihu gọvanọ. Gọvanọ jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?”
Jisọs sịrị ya, “Gị onwe gị kwuru ya.” 12Mgbe ndịisi nchụaja na ndị okenye boro ya ebubo ụgha, o kwughị ihe ọbụla.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.