Matiu 27:38
Matthew 27:38 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha kpọgidekwara ya na ndị ohi abụọ nʼobe. Otu onye nʼaka nri, onye nke ọzọ nʼaka ekpe ya.
Matthew 27:38 in English
Matthew 27:38 · Berean Standard Bible
Two robbers * were crucified with Him, one on His right hand and the other on His left.
Context
36Ha nọdụkwara ala nʼebe ahụ na-eche ya nche. 37Nʼelu ebe isi ya dị, ka ha debere ihe ha dekwasịrị ebubo ha boro ya. Nke a bụ ihe ha dere:
Onye a bụ Jisọs, Eze ndị Juu. 38Ha kpọgidekwara ya na ndị ohi abụọ nʼobe. Otu onye nʼaka nri, onye nke ọzọ nʼaka ekpe ya. 39Ndị na-agafe nʼụzọ na-ekwutọ ya, na-efufekwa isi ha, 40na-asịkwa, “Leenụ onye nwere ike ịkwatu ụlọnsọ Chineke wughachi ya na mkpụrụ ụbọchị atọ! Zọpụtanụ onwe gị! Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke si nʼelu obe ahụ rịdata!”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.