Matiu 27:35
Matthew 27:35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ha kpọgidechara ya nʼelu obe. Ha fere nza nke ha jiri kee uwe ya nʼetiti onwe ha.*
Matthew 27:35 in English
Matthew 27:35 · Berean Standard Bible
When they had crucified Him, they divided up His garments by casting lots.*
Context
33Mgbe ha bịarutere nʼebe a na-akpọ Gọlgọta (nke pụtara, “ebe okpokoro isi”). 34Ha nyere ya mmanya a gwara ọgwụ ilu ka ọ ṅụọ. Mgbe o detụrụ ya ire, o kweghị ya ọṅụṅụ. 35Mgbe ha kpọgidechara ya nʼelu obe. Ha fere nza nke ha jiri kee uwe ya nʼetiti onwe ha.* 36Ha nọdụkwara ala nʼebe ahụ na-eche ya nche. 37Nʼelu ebe isi ya dị, ka ha debere ihe ha dekwasịrị ebubo ha boro ya. Nke a bụ ihe ha dere:
Onye a bụ Jisọs, Eze ndị Juu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.