Matiu 27:34
Matthew 27:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha nyere ya mmanya a gwara ọgwụ ilu ka ọ ṅụọ. Mgbe o detụrụ ya ire, o kweghị ya ọṅụṅụ.
Matthew 27:34 in English
Matthew 27:34 · Berean Standard Bible
they offered Him wine to drink, mixed with gall; but after tasting it, He refused to drink it.
Context
32Mgbe ha na-apụ, ha zutere otu nwoke onye obodo Sirini a na-akpọ Saimọn. Ha manyere ya ka o buru obe ya. 33Mgbe ha bịarutere nʼebe a na-akpọ Gọlgọta (nke pụtara, “ebe okpokoro isi”). 34Ha nyere ya mmanya a gwara ọgwụ ilu ka ọ ṅụọ. Mgbe o detụrụ ya ire, o kweghị ya ọṅụṅụ. 35Mgbe ha kpọgidechara ya nʼelu obe. Ha fere nza nke ha jiri kee uwe ya nʼetiti onwe ha.* 36Ha nọdụkwara ala nʼebe ahụ na-eche ya nche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.