Matiu 27:19
Matthew 27:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ọ nọkwasịrị nʼelu oche ikpe ya, nwunye ya zitere ozi sị ya, “Wepụkwa aka gị nʼihe gbasara nwoke onye ezi omume ahụ. Nʼihi na ahụjuru m anya na nrọ nʼabalị gara aga nʼihi ya.”
Matthew 27:19 in English
Matthew 27:19 · Berean Standard Bible
While Pilate was sitting on the judgment seat, his wife sent him this message: “Have nothing to do with that innocent man, for I have suffered terribly in a dream today because of Him.”
Context
17Mgbe igwe mmadụ niile zukọrọ, Pailet sịrị ha, “Onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu, ọ bụ Jisọs Barabas ka ọ bụ Jisọs onye a na-akpọ Kraịst?” 18Nʼihi na ọ maara nke ọma na ọ bụ site nʼekworo ka ha ji rara Jisọs nye nʼaka ya. 19Mgbe ọ nọkwasịrị nʼelu oche ikpe ya, nwunye ya zitere ozi sị ya, “Wepụkwa aka gị nʼihe gbasara nwoke onye ezi omume ahụ. Nʼihi na ahụjuru m anya na nrọ nʼabalị gara aga nʼihi ya.” 20Ma ndịisi nchụaja na ndị okenye kwagidere igwe mmadụ ahụ ka ha rịọ ya, ka ọ hapụrụ ha Barabas, ma nye ha Jisọs ka ha gbuo ya. 21Ọzọkwa, gọvanọ sịrị ha, “Nʼime mmadụ abụọ ndị a onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu?”
Ha sịrị, “Barabas!”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.