Matiu 27:18
Matthew 27:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ọ maara nke ọma na ọ bụ site nʼekworo ka ha ji rara Jisọs nye nʼaka ya.
Matthew 27:18 in English
Matthew 27:18 · Berean Standard Bible
For he knew it was out of envy that they had handed Jesus over to him.
Context
16Ma nʼoge a e nwere otu onye mkpọrọ nke ọtụtụ mmadụ maara nke ọma. A na-akpọ Jisọs Barabas. 17Mgbe igwe mmadụ niile zukọrọ, Pailet sịrị ha, “Onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu, ọ bụ Jisọs Barabas ka ọ bụ Jisọs onye a na-akpọ Kraịst?” 18Nʼihi na ọ maara nke ọma na ọ bụ site nʼekworo ka ha ji rara Jisọs nye nʼaka ya. 19Mgbe ọ nọkwasịrị nʼelu oche ikpe ya, nwunye ya zitere ozi sị ya, “Wepụkwa aka gị nʼihe gbasara nwoke onye ezi omume ahụ. Nʼihi na ahụjuru m anya na nrọ nʼabalị gara aga nʼihi ya.” 20Ma ndịisi nchụaja na ndị okenye kwagidere igwe mmadụ ahụ ka ha rịọ ya, ka ọ hapụrụ ha Barabas, ma nye ha Jisọs ka ha gbuo ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.