Matiu 26:36
Matthew 26:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Jisọs bịara nʼogige ahụ a na-akpọ Getsameni, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Nọdụnụ nʼebe a ka m gaa nʼihu nke nta kpee ekpere.”
Matthew 26:36 in English
Matthew 26:36 · Berean Standard Bible
At that time Jesus went with His disciples to a place called Gethsemane, and He told them, “Sit here while I go over there and pray.”
Context
34Jisọs sịrị, “Nʼezie agwa m gị, nʼabalị taa, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.” 35Ma Pita kwuru sị, “Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka m soro gị nwụọ, agaghị m agọnarị gị.” Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ndị ahụ niile na-eso ụzọ ya kwuru. 36Mgbe Jisọs bịara nʼogige ahụ a na-akpọ Getsameni, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Nọdụnụ nʼebe a ka m gaa nʼihu nke nta kpee ekpere.” 37Ọ kpọọrọ Pita tinyere onwe ya, na ụmụ Zebedi abụọ. Ọ malitere inwe obi mwute nʼime onwe ya. Obi malitekwara ịlọ ya mmiri. 38Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, “Ọ na-ewute mkpụrụobi m nke ukwuu ruo nʼọnụ ọnwụ. Nọgidenụ nʼebe a soro m na-eche nche.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.