Native Bible

Matthew 26:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ana m agwa unu, na-agaghị m aṅụ mmanya sitere na mkpụrụ vaịnị ọzọ, tutu ruo ụbọchị ahụ mụ na unu ga-aṅụ ya nʼụzọ dị iche nʼalaeze Nna m.”

Matthew 26:29 in English

Matthew 26:29 · Berean Standard Bible

I tell you, I will not drink of this fruit of the vine from now on until that day when I drink it anew with you in My Father’s kingdom.”

Context

27Mgbe ahụ kwa, o burukwara iko mmanya, ma mgbe o nyechara ekele, o bunyere ya ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Unu niile ṅụọnụ site nʼiko a. 28Nʼihi na nke a bụ ọbara m nke bụ akara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. A na-awụsa ya maka ọtụtụ mgbaghara mmehie. 29Ana m agwa unu, na-agaghị m aṅụ mmanya sitere na mkpụrụ vaịnị ọzọ, tutu ruo ụbọchị ahụ mụ na unu ga-aṅụ ya nʼụzọ dị iche nʼalaeze Nna m.” 30Mgbe ha bụsịrị abụ, ha pụrụ gaa nʼUgwu Oliv. 31Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Nʼabalị taa, unu niile ga-agbahapụ naanị m. Nʼihi na e dere ya, sị: “ ‘Aga m etigbu onye ọzụzụ atụrụ, atụrụ nke igwe atụrụ ahụ ga-agbasasịkwa.’*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.