Matiu 24:35
Matthew 24:35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga.
Matthew 24:35 in English
Matthew 24:35 · Berean Standard Bible
Heaven and earth will pass away, but My words will never pass away.
Context
33Otu a kwa, mgbe unu na-ahụ ihe ndị a niile ka ha na-eme marakwanụ na ọ nọ nso, ọ bụladị nʼọnụ ụzọ unu. 34Nʼezie agwa m unu, ihe ndị a niile aghaghị imezu tupu ọgbọ a agabiga. 35Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga. 36“Ma o nweghị onye ọbụla maara ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ ga-abụ. Ọ bụladị ndị mmụọ ozi nọ nʼeluigwe amaghị ya. Ọkpara ahụ amakwaghị. Ọ bụ naanị Nna maara ya. 37Ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị ka ọ dị nʼụbọchị Noa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.