Native Bible

Matthew 23:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ihe niile ha na-eme bụ ka ndị mmadụ hụ ha. Ha na-eme ka igbe nta* e tinyere iwu ndị dị mkpa e depụtara nke ha na-ekekwasị nʼegedege ihu na nʼaka dị obosara na-emekwa ka ọnụnụ uwe ha buo ibu.

Matthew 23:5 in English

Matthew 23:5 · Berean Standard Bible

All their deeds are done for men to see. They broaden their phylacteries and lengthen their tassels.

Context

3Ya mere, meenụ ma na-edebekwanụ ihe niile ha na-agwa unu. Ma unu esokwala omume ha. Nʼihi na ha adịghị eme ihe ha na-ekwusa. Ha na-ekwu otu ihe ma na-eme ihe ọzọ. 4Ha na-eke ibu dị arọ dịkwa ike obubu bokwasị ndị ọzọ nʼubu, ma ha onwe ha agaghị eweli ọ bụladị otu mkpịsịaka i buli ha. 5“Ihe niile ha na-eme bụ ka ndị mmadụ hụ ha. Ha na-eme ka igbe nta* e tinyere iwu ndị dị mkpa e depụtara nke ha na-ekekwasị nʼegedege ihu na nʼaka dị obosara na-emekwa ka ọnụnụ uwe ha buo ibu. 6Ha hụrụ ịnọ nʼisi oche nʼoge mmemme oriri ọbụla na ịnọkwasị nʼoche kachasị elu nʼụlọ ekpere nʼanya. 7Ọ na-amasị ha mgbe a na-ekele ha ekele pụrụ iche nʼọma ahịa, ndị ọzọ a na-akpọkwa ha, ‘Onye ozizi.’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.