Native Bible

Matthew 20:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Jisọs bịaruru nʼebe ha nọ, o guzoro kpọọ ha, jụọ ha sị, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?”

Matthew 20:32 in English

Matthew 20:32 · Berean Standard Bible

Jesus stopped and called them. “What do you want Me to do for you?” He asked.

Context

30Ndị ìsì abụọ nọ nʼakụkụ ụzọ ahụ. Mgbe ha nụrụ na ọ bụ Jisọs na-abịa, ha malitere iti mkpu nʼoke olu na-asị, “Onyenwe anyị, Nwa Devid, meere anyị ebere!” 31Igwe mmadụ ahụ baara ha mba ka ha mechie ọnụ ha. Ma ndịisi ahụ nọgidesịrị ike na-eti mkpu nʼoke olu na-asị, “Onyenwe anyị, Nwa Devid, meere anyị ebere!” 32Mgbe Jisọs bịaruru nʼebe ha nọ, o guzoro kpọọ ha, jụọ ha sị, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?” 33Ha zara sị ya, “Onyenwe anyị, biko, anyị chọrọ ka i mee ka anyị hụ ụzọ.” 34Jisọs nwere ọmịiko nʼahụ ha. O metụrụ ha aka nʼanya. Ngwangwa ha bidoro ịhụ ụzọ, ma sorokwa ya. 20:25 Maọbụ, ndị mba ọzọ

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.