Matiu 2:17
Matthew 2:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E sitekwara otu a mezuo amụma ahụ Jeremaya buru sị,
Matthew 2:17 in English
Matthew 2:17 · Berean Standard Bible
Then what was spoken through the prophet Jeremiah was fulfilled:
Context
15Ebe ahụ ka ha nọgidere tutu ruo mgbe Herọd nwụrụ. Nke a mere ka okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma mezuo. “Ọ bụkwa site nʼIjipt ka m kpọpụtara nwa m.”* 16Iwe were Herọd nke ukwuu mgbe ọ chọpụtara na ndị amamihe ahụ aghọọla ya aghụghọ. Nʼihi ya, o nyere iwu banyere Betlehem na obodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu, ka ha gbuo ụmụntakịrị niile nọ nʼobodo ndị a, bụ ndị gbara site nʼafọ abụọ gbadaa, dị ka ihe ọ nụtara site nʼọnụ ndị amamihe si dị. 17E sitekwara otu a mezuo amụma ahụ Jeremaya buru sị, 18“A nụrụ otu olu na Rema,
ịkwa akwa na oke iru ụjụ dị,
Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya;
ọ dịghị nkasiobi ọbụla dịrị ya,
nʼihi na ha adịghịkwa.”* 19Mgbe Herọd nwụrụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere Josef na nrọ nʼIjipt
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.