Matiu 2:18
Matthew 2:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“A nụrụ otu olu na Rema, ịkwa akwa na oke iru ụjụ dị, Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya; ọ dịghị nkasiobi ọbụla dịrị ya, nʼihi na ha adịghịkwa.”*
Matthew 2:18 in English
Matthew 2:18 · Berean Standard Bible
“A voice is heard in Ramah, weeping and great mourning, Rachel weeping for her children, and refusing to be comforted, because they are no more.”*
Context
16Iwe were Herọd nke ukwuu mgbe ọ chọpụtara na ndị amamihe ahụ aghọọla ya aghụghọ. Nʼihi ya, o nyere iwu banyere Betlehem na obodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu, ka ha gbuo ụmụntakịrị niile nọ nʼobodo ndị a, bụ ndị gbara site nʼafọ abụọ gbadaa, dị ka ihe ọ nụtara site nʼọnụ ndị amamihe si dị. 17E sitekwara otu a mezuo amụma ahụ Jeremaya buru sị, 18“A nụrụ otu olu na Rema,
ịkwa akwa na oke iru ụjụ dị,
Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya;
ọ dịghị nkasiobi ọbụla dịrị ya,
nʼihi na ha adịghịkwa.”* 19Mgbe Herọd nwụrụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere Josef na nrọ nʼIjipt 20sị ya, “Bilie, kpọrọ nwantakịrị ahụ na nne ya laghachi nʼala Izrel nʼihi na ndị na-achọ igbu ya anwụọla.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.