Native Bible

Matthew 19:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O bikwasịrị ha aka nʼisi gọzie ha niile tupu ọ hapụ ha pụọ.

Matthew 19:15 in English

Matthew 19:15 · Berean Standard Bible

And after He had placed His hands on them, He went on from there.

Context

13Mgbe ahụ e kuteere ya ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka, kpeekwara ha ekpere. Ma ndị na-eso ụzọ ya baara ndị kutere ha mba. 14Ma Jisọs sịrị ha, “Kweenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m, unu egbochikwala ha. Nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ndị dị otu a.” 15O bikwasịrị ha aka nʼisi gọzie ha niile tupu ọ hapụ ha pụọ. 16Otu onye bịakwutere ya, jụọ ya ajụjụ sị, “Ezi onye ozizi, olee ezi ihe m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?” 17Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji ajụ m ajụjụ banyere ihe bụ ezi ihe? Ọ dị naanị otu onye nke bụ ezi mmadụ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịba nʼime ndụ ahụ, debe iwu niile e nyere.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.