Native Bible

Matthew 15:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Ana m emere igwe mmadụ ndị a obi ebere, nʼihi na mụ na ha anọọla ụbọchị atọ nʼebe a, ma ha eribeghị nri ọbụla. Agaghị m ezilaga ha na-erighị nri, nʼihi na ha nwere ike ịda nʼụzọ.”

Matthew 15:32 in English

Matthew 15:32 · Berean Standard Bible

Then Jesus called His disciples to Him and said, “I have compassion for this crowd, because they have already been with Me three days and have nothing to eat. I do not want to send them away hungry, or they may faint along the way.”

Context

30Igwe mmadụ dị ukwuu bịakwutere ya. Ha duteere ya ndị ngwụrọ, na ndị ìsì, na ndị aka ha na ndị ụkwụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, na ndị ogbi, na ọtụtụ ndị ọzọ. Ha tọgbọrọ ha nʼụkwụ ya, ọ gwọkwara ha niile. 31Ọ tụrụ mmadụ niile nʼanya mgbe ha hụrụ ndị ogbi ka ha bidoro ikwu okwu. Mgbe ha hụkwara na a gwọrọ ndị aka ha, na ndị ụkwụ ha nwụrụ anwụ, o jukwara ha anya ịhụ na ndị ngwụrọ gara ije, na ndị ìsì hụkwara ụzọ. Ha toro Chineke nke Izrel. 32Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Ana m emere igwe mmadụ ndị a obi ebere, nʼihi na mụ na ha anọọla ụbọchị atọ nʼebe a, ma ha eribeghị nri ọbụla. Agaghị m ezilaga ha na-erighị nri, nʼihi na ha nwere ike ịda nʼụzọ.” 33Ndị na-eso ụzọ ya sịrị, “Ebee ka anyị ga-enweta nri ga-ezuru igwe mmadụ ndị a nʼọzara a?” 34Jisọs jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka unu nwere?” Ha sịrị ya, “Ogbe achịcha asaa na azụ ole na ole.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.