Matiu 15:34
Matthew 15:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jisọs jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka unu nwere?” Ha sịrị ya, “Ogbe achịcha asaa na azụ ole na ole.”
Matthew 15:34 in English
Matthew 15:34 · Berean Standard Bible
“How many loaves do you have?” Jesus asked. “Seven,” they replied, “and a few small fish.”
Context
32Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Ana m emere igwe mmadụ ndị a obi ebere, nʼihi na mụ na ha anọọla ụbọchị atọ nʼebe a, ma ha eribeghị nri ọbụla. Agaghị m ezilaga ha na-erighị nri, nʼihi na ha nwere ike ịda nʼụzọ.” 33Ndị na-eso ụzọ ya sịrị, “Ebee ka anyị ga-enweta nri ga-ezuru igwe mmadụ ndị a nʼọzara a?” 34Jisọs jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka unu nwere?”
Ha sịrị ya, “Ogbe achịcha asaa na azụ ole na ole.” 35Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala. 36O weere ogbe achịcha asaa na azụ ole na ole ahụ kelee Chineke ekele. Ọ nyawasịrị ha, nye ndị na-eso ụzọ ya. Ndị na-eso ụzọ ya nyekwara igwe mmadụ ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.