Matiu 14:18
Matthew 14:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ sịrị ha, “Wetaranụ m ha nʼebe a.”
Matthew 14:18 in English
Matthew 14:18 · Berean Standard Bible
“Bring them here to Me,” Jesus said.
Context
16Ma Jisọs gwara ha sị, “Ọ dịghị mkpa na ha ga-ala. Nyenụ ha nri ka ha rie.” 17Ha zara ya sị, “Ọ bụ naanị ogbe achịcha ise na azụ abụọ ka anyị nwere.” 18Ọ sịrị ha, “Wetaranụ m ha nʼebe a.” 19Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼahịhịa. O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ahụ welie anya ya elu nye Chineke ekele. Ọ nyawara achịcha ahụ, nye ha ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-eso ụzọ ya nyere ha igwe mmadụ ahụ. 20Onye ọbụla riri rijuo afọ. Emesịa, ndị na-eso ụzọ Jisọs tụtụkọtara iberibe achịcha dara nʼala tụtụjuo ha nkata iri na abụọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.